1 Kings 5

Nkwado maka iwu Ụlọnsọ ukwu

1Mgbe Hiram eze Taịa nụrụ na eteela Solomọn mmanụ ịbụ eze nʼọnọdụ nna ya Devid, o zipụrụ ndị ozi ya ijekwuru Solomọn, nʼihi na ya na Devid bụ enyi, dịrịkwa na mma. 2Mgbe ahụ, Solomọn zigara Hiram ozi, sị ya:

3“Ị maara na Devid nna m enweghị ike iwu ụlọnsọ ukwuu nye Aha Onyenwe anyị Chineke ya, nʼihi agha niile ọ lụrụ mgbe ọ dị ndụ. Ọ nọkwa na-eche ka Onyenwe anyị nye ya udo. 4Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke m enyela m udo nʼakụkụ ọbụla. Enwekwaghị m ndị iro, ma ọ bụkwanụ ihe ndakwasị ọjọọ ọbụla. 5Nʼihi ya, ana m achọ iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị Chineke m, dịka Onyenwe anyị gwara nna m Devid mgbe ọ sịrị ya, ‘Nwa gị nwoke, onye m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị, ga-ewu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.’

6“Ya mere, nye iwu ka e gbutuoro m osisi sida nke Lebanọn. Ndị ọrụ m ga-esoro ndị nke gị nʼọrụ a. Aga m akwụ gị ihe ọbụla i kpebiri bụ ụgwọ ọrụ ha. Ị maara na anyị enweghị ndị ọka igbutu osisi dịka ndị Saịdọn.”

7Mgbe Hiram nụrụ ozi Solomọn ziri, obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu. O kwuru sị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị taa, nʼihi na o nyela Devid nwa nwoke nwere amamihe ịchị mba ukwuu a.”

8Ya mere, Hiram zigaara Solomọn ozi sị,

“Anụla m ozi i ziteere m. Aga m emekwa ihe niile dịka i kwuru banyere i budatara gị osisi sida na osisi junipa.
9Ndị ohu m ga-esi nʼugwu Lebanọn budaruo ha nʼosimiri Mediterenịa. A ga-ekekọta ha ọnụ, zitere gị ha nʼebe ị chọrọ ịnọ buru ha. Mgbe ha sere nʼelu mmiri rute ebe ị chọrọ, anyị ga-atọsakwara gị ha, ka i buru ha. Ma gị onwe gị ga-eme ihe bụ ọchịchọ m, site na-inye ndị ụlọ m ihe oriri.”

10Nʼụzọ dị otu a, Hiram nọgidere na-ezitere Solomọn osisi sida na junipa niile ọ chọrọ. 11Solomọn nyere Hiram na ezinaụlọ ya narị puku bushel, na iri puku bushel ọka wiiti abụọ, ka ọ bụrụ ihe oriri nye ezinaụlọ ya, tinyekwara narị puku galọọnụ, na iri puku galọọnụ abụọ nke mmanụ oliv asụrụ asụ. Solomọn nọgidere na-enye Hiram ihe ndị a kwa afọ. 12Onyenwe anyị nyere Solomọn amamihe dị ukwuu dịka o kwere ya na nkwa. Hiram na Solomọn nwere mmekọ udo, ha abụọ gbakwara ndụ.

13Eze Solomọn, sitere nʼakụkụ Izrel niile kpọbata ndị ọrụ mmanye ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ. 14Nʼotu ọnwa, ọ na-eziga puku mmadụ iri nʼime ndị a ka ha gaa Lebanọn ịrụ ọrụ. Nʼọnwa ọzọ, ọ na-ezigakwa puku mmadụ iri ka ha gaa gbanwee ndị buuru ụzọ gaa. Nʼụzọ dị otu a, otu ụzọ nʼime iri puku mmadụ atọ ndị a na-anọ na Lebanọn otu ọnwa maka ịrụ ọrụ, ma ha na-alọta zuo ike ọnwa abụọ. Adoniram c bụ onyeisi ndị ọrụ mmanye a. 15Solomọn nwere ndị ọrụ ọzọ ọnụọgụgụ ha dị iri puku asaa na-ebu ibu, nweekwa ndị na-awa nkume nʼugwu ọnụọgụgụ ha dị iri puku asatọ. 16Nʼagụnyeghị ndị a, o nwekwara ndịisi, ndị na-elekọta ndị ọrụ ndị a, ọnụọgụgụ ha dị puku atọ na narị atọ. 17Dịka iwu eze si dị, ha na-esite nʼebe a na-awa nkume ebupụta nkume dị mma buru ibu nke e ji ewu ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ 18Ndị ikom si Gebal, nyere ndị ọrụ Solomọn na ndị ọrụ Hiram aka, igbutu osisi na ịwa ha. Ha nyekwara aka ịkwado nkume e ji ewu ụlọ ahụ.

Copyright information for IboBIU